Skip to main content
Table of Contents

Android: Budata Akwụkwọ Nsọ Na-Adịghị Na Intanetị

Budata Ụdị-Nsụgharị-Gasị Akwụkwọ Nsọ Ka Ịgụọ Ha Na Offlaịnụ. Gụọ Akwụkwọ Nsọ ebe ọbụla ị nọ, ọbụlagodi mgbe ị na-enweghị ike ịbanyè na Intanetị. Ọ bụghị ụdị-nsụgharị Akwụkwọ Nsọ niile dị maka nbudata…

Leah Nelson
Updated by Leah Nelson
Table of Contents

Budata Ụdị-Nsụgharị-Gasị Akwụkwọ Nsọ Ka Ịgụọ Ha Na Offlaịnụ

Gụọ Akwụkwọ Nsọ ebe ọbụla ị nọ, ọbụlagodi mgbe ị na-enweghị ike ịbanyè na Intanetị.

Ọ bụghị ụdị-nsụgharị Akwụkwọ Nsọ niile dị maka nbudata.
  1. Gbaa mbọ hụ na ngwaọrụ mkpanaka gị nwerè njikọ Intanetị siri ike. Ọ dị mkpa ka ị nwee Wi-Fi.
  2. Lee nke ọma na ị banyerè n'ezie na Ngwá Baịbụl.
  3. Gbanwee ụdị-nsụgharị Akwụkwọ Nsọ ma ụdị-nsụgharị Akwụkwọ Nsọ ọbụla ahọpụtarà gà-èbudatá ozugbo akpaghị-aka ma dị njikere gị iji ya mee ihe n'anọ̀ghị ọnlaịnụ.
    Lee otù esi àgụ́ ya n'emeghị ya nbudata ebe a.

Gụọ Ụdị-Nsụgharị-Gasị Akwụkwọ Nsọ N'Emeghị Ha Nbudata

Sòró usoro ndị a iji hụchatụ́ ụdị-nsụgharị Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ̀ gụọ ya n'ebudatàghị ya.

  1. Họrọ taabụ Akwụkwọ Nsọ.
  2. N'aka nri elu: Họrọ nkebi-aha Ụdị Nsụgharị Akwụkwọ Nsọ (dịka, NIV).
  3. Họrọ ụdị nsụgharị ahụ site na ndepụta ma ọ bụ pịa aka na asụsụ maka ụdị nsụgharị gasị dị n'asụsụ ọzọ.
  4. Họrọ bọtịnụ dị n'akụkụ ụdị-nsụgharị ịchọrọ ịgụ.
  5. Họrọ Gụọ na Akwụkwọ Nsọ iji hụchatụ́ ụdị-nsụgharị ahụ na-ebudatàghị ya.

Hichapụ́ Ụdị-Nsụgharị (Gasị) Akwụkwọ Nsọ Ebudatarà

Ọ bụ̀ ezie na ụdị-nsụgharị ndị ebudatarà bụ̀ obere faịlụ ederede gasị, ị nwerè ike ịchọ iwepụ otu mgbe ụfọdụ iji mepee ohere maka nchekwa ma ọ bụ̀ maka idozi nsogbu.

E nwere ụzọ abụọ isi wepụ ụdị Akwụkwọ Nsọ ebudatara:

  1. Site na taabụ Akwụkwọ Nsọ:
    1. Họrọ taabụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụrụ na ahọpụtabeghị ya.
    2. N'aka nri elu: họrọ nkebi-aha yabụ́ ụdị-nsụgharị Akwụkwọ Nsọ.
    3. Pịa aka ogologo oge na otu ụdị-nsụgharị, wee pịa Ee iji wepụ ụdị-nsụgharị ahụ.
    Ma ọ bụ̀
    1. Pịa aka na ntụpọ atọ dị n'aka nri nke aha nkenke ụdị nsụgharị Baịbụl ahụ wee họrọ Wepụ.
  2. Site na taabụ Gị:
    1. Họrọ taabụ Gị ma ọ bụrụ na ahọpụtabèghị ya.
    2. Họrọ Ntọala gia gasị (dị n'elu aka nri).
    3. Họrọ Jìkwaa Ụdị Nsụgharị Gasị Akwụkwọ Nsọ Dị́ Na Ọfflaịnụ.
    4. Pịa aka na WEPỤ.
A nà-èbú ụ̀zọ̀ depụta ụdị-nsụgharị ndị YouVersion nà-ènyé n'asụsụ ị họrọlà site na ụdị-nsụgharị kachasị ọhụrụ ebudatarà, wee depụtazie ha n'ụdị mkpụrụedemede.

Ajụjụ Ndị Ana-Ajụkarị Bànyeré Nbudata-Gasị Ụdị-Nsụgharị-Gasị Akwụkwọ Nsọ

Enwerè m ike ibudatà ọdịyo ya?

N'ụzọ dị mwute, ụdị ngwa dị ugbu a anaghị akwado ibudata ọdịyo maka iji na-adịghị na Intanetị. Mmachibido a si na nnukwu ohere nchekwa faịlụ ọdịyo na-ewe na ngwaọrụ mkpanaka. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ngwaọrụ mkpanaka nwere obere ike nchekwa, ịnabata nnukwu faịlụ ọdịyo bụ ihe siri ike. YouVersion chọrọ ijide n'aka na ngwọta anyị na-arụ ọrụ na ọtụtụ ngwaọrụ nke obodo ụwa anyị na-eji. E nwere ụfọdụ ihe dị iche, mana anyị chọrọ ijide n'aka na ngwọta anyị na-arụ ọrụ na ha niile. Ọ bụ ezie na anyị na-achọ iwebata ọrụ ọdịyo na-adịghị na Intanetị n'ọdịnihu, anyị enweghị ike ịnye oge akọwapụtara ugbu a.

Gịnị merè nà-àpụghị́ m iwepụ ụdị-nsụgharị Akwụkwọ Nsọ?

Ebe ọ bụ na ọtụtụ atụmatụ ngwa ahụ na-adabere na Akwụkwọ Nsọ, opekata mpe otu ụdị ga-adịrịrị. Ya mere, enwere ike iwepụ ụdị niile ewezuga ụdị ndabara. Asụsụ ọ bụla nwere ụdị Akwụkwọ Nsọ ndabara ya.

Ụdị-nsụgharị ndabara bụ̀ nke etinyerè mgbe ị nà-ebudata ma n'etinye Ngwá Baịbụl na ngwaọrụ gị.

How did we do?

Android: Nke Metụtara

Contact