Table of Contents
Android: Budata Akwụkwọ Nsọ Na-Adịghị Na Intanetị
Budata Ụdị-Nsụgharị-Gasị Akwụkwọ Nsọ Ka Ịgụọ Ha Na Offlaịnụ. Gụọ Akwụkwọ Nsọ ebe ọbụla ị nọ, ọbụlagodi mgbe ị na-enweghị ike ịbanyè na Intanetị. Ọ bụghị ụdị-nsụgharị Akwụkwọ Nsọ niile dị maka nbudata…
Table of Contents
Budata Ụdị-Nsụgharị-Gasị Akwụkwọ Nsọ Ka Ịgụọ Ha Na Offlaịnụ
Gụọ Akwụkwọ Nsọ ebe ọbụla ị nọ, ọbụlagodi mgbe ị na-enweghị ike ịbanyè na Intanetị.
- Gbaa mbọ hụ na ngwaọrụ mkpanaka gị nwerè njikọ Intanetị siri ike. Ọ dị mkpa ka ị nwee Wi-Fi.
- Lee nke ọma na ị banyerè n'ezie na Ngwá Baịbụl.
- Gbanwee ụdị-nsụgharị Akwụkwọ Nsọ ma ụdị-nsụgharị Akwụkwọ Nsọ ọbụla ahọpụtarà gà-èbudatá ozugbo akpaghị-aka ma dị njikere gị iji ya mee ihe n'anọ̀ghị ọnlaịnụ.Lee otù esi àgụ́ ya n'emeghị ya nbudata ebe a.
Gụọ Ụdị-Nsụgharị-Gasị Akwụkwọ Nsọ N'Emeghị Ha Nbudata
Sòró usoro ndị a iji hụchatụ́ ụdị-nsụgharị Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ̀ gụọ ya n'ebudatàghị ya.
- Họrọ taabụ Akwụkwọ Nsọ.
- N'aka nri elu: Họrọ nkebi-aha Ụdị Nsụgharị Akwụkwọ Nsọ (dịka, NIV).
- Họrọ ụdị nsụgharị ahụ site na ndepụta ma ọ bụ pịa aka na asụsụ maka ụdị nsụgharị gasị dị n'asụsụ ọzọ.
- Họrọ bọtịnụ ⓘ dị n'akụkụ ụdị-nsụgharị ịchọrọ ịgụ.
- Họrọ Gụọ na Akwụkwọ Nsọ iji hụchatụ́ ụdị-nsụgharị ahụ na-ebudatàghị ya.
Hichapụ́ Ụdị-Nsụgharị (Gasị) Akwụkwọ Nsọ Ebudatarà
Ọ bụ̀ ezie na ụdị-nsụgharị ndị ebudatarà bụ̀ obere faịlụ ederede gasị, ị nwerè ike ịchọ iwepụ otu mgbe ụfọdụ iji mepee ohere maka nchekwa ma ọ bụ̀ maka idozi nsogbu.
E nwere ụzọ abụọ isi wepụ ụdị Akwụkwọ Nsọ ebudatara:
- Site na taabụ Akwụkwọ Nsọ:
- Họrọ taabụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụrụ na ahọpụtabeghị ya.
- N'aka nri elu: họrọ nkebi-aha yabụ́ ụdị-nsụgharị Akwụkwọ Nsọ.
- Pịa aka ogologo oge na otu ụdị-nsụgharị, wee pịa Ee iji wepụ ụdị-nsụgharị ahụ.
- Pịa aka na ntụpọ atọ dị n'aka nri nke aha nkenke ụdị nsụgharị Baịbụl ahụ wee họrọ Wepụ.
- Site na taabụ Gị:
- Họrọ taabụ Gị ma ọ bụrụ na ahọpụtabèghị ya.
- Họrọ Ntọala gia gasị (dị n'elu aka nri).
- Họrọ Jìkwaa Ụdị Nsụgharị Gasị Akwụkwọ Nsọ Dị́ Na Ọfflaịnụ.
- Pịa aka na WEPỤ.
Ajụjụ Ndị Ana-Ajụkarị Bànyeré Nbudata-Gasị Ụdị-Nsụgharị-Gasị Akwụkwọ Nsọ
Enwerè m ike ibudatà ọdịyo ya?
N'ụzọ dị mwute, ụdị ngwa dị ugbu a anaghị akwado ibudata ọdịyo maka iji na-adịghị na Intanetị. Mmachibido a si na nnukwu ohere nchekwa faịlụ ọdịyo na-ewe na ngwaọrụ mkpanaka. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ngwaọrụ mkpanaka nwere obere ike nchekwa, ịnabata nnukwu faịlụ ọdịyo bụ ihe siri ike. YouVersion chọrọ ijide n'aka na ngwọta anyị na-arụ ọrụ na ọtụtụ ngwaọrụ nke obodo ụwa anyị na-eji. E nwere ụfọdụ ihe dị iche, mana anyị chọrọ ijide n'aka na ngwọta anyị na-arụ ọrụ na ha niile. Ọ bụ ezie na anyị na-achọ iwebata ọrụ ọdịyo na-adịghị na Intanetị n'ọdịnihu, anyị enweghị ike ịnye oge akọwapụtara ugbu a.
Gịnị merè nà-àpụghị́ m iwepụ ụdị-nsụgharị Akwụkwọ Nsọ?
Ebe ọ bụ na ọtụtụ atụmatụ ngwa ahụ na-adabere na Akwụkwọ Nsọ, opekata mpe otu ụdị ga-adịrịrị. Ya mere, enwere ike iwepụ ụdị niile ewezuga ụdị ndabara. Asụsụ ọ bụla nwere ụdị Akwụkwọ Nsọ ndabara ya.
How did we do?
Android: Nke Metụtara